1 Timothy 1:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ.
Igbo 2006
nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,