1 Timothy 1:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.
Igbo 2006
Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.