1 Timothy 1:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Chineke meere m ebere ime ka Kraịst Jisọs were m gosi ndị ọzọ otu o si bụrụ onye ogologo ntachi obi nꞌebe ndị ajọ omume nọ, ka m bụrụ ihe àma nye ndị ọzọ na ha onwe ha nwekwara ike inweta ndụ ebighị ebi.
Igbo 2006
otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi.