1 Timothy 1:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jidesie okwukwe i nwere nꞌime Kraịst ike. Meekwa ka akọnuche gị dị ọcha mgbe nile. Nꞌihi na ụfọdụ mmadụ eleziela anya jụ ime ezi ihe akọnuche ha gwara ha. Ma ha emeela ihe ahụ ha maara na ọ jọrọ njọ. Ugbu a ọ bụghị ihe iju anya na ha esitela nꞌokwukwe anyị dapụ.
Igbo 2006
nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe.