1 Timothy 1:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe m chọrọ ịhụ bụ ka ụmụ Chineke nile jupụta nꞌịhụnanya nke na-esite nꞌobi dị ọcha. Achọkwara m ịhụ na ha nwere akọnuche zuru oke, na okwukwe siri ike, nke aghụghọ na-adịghị.
Igbo 2006
Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị.