1 Timothy 2:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe mbụ m na-adụsị gị ọdụ ike ka i mee bụ nke a. Na-ekpesịrị ndị ọzọ ekpere ike. Rịọ arịrịọ ka Chineke meere ha ebere. Nꞌime ekpere gị nile na-enyekwa Chineke ekele nꞌihi ihe ọ ga-emere ha.
Igbo 2006
Ya mere ihe mbu m'nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n'ihi madu nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,