1 Timothy 3:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya.
Igbo 2006
Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.