1 Timothy 3:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.
Igbo 2006
Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.