1 Timothy 4:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya nꞌihi na ị bụ okorọbịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịma atụ na ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe. Mee ka ha soro ụzọ i si ezi ihe na ụzọ i si ebi ndụ gị. Bụrụkwa ihe ịma atụ nye ha, ma ọ bụ ihe ilere anya nꞌime okwukwe gị, na ịhụnanya gị, na iche uche zuru oke gị.
Igbo 2006
Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.