1 Timothy 4:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu.
Igbo 2006
n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.