1 Timothy 5:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.
Igbo 2006
Ya mere anamezube ka umu-ab͕ọghọ ndi di-ha nwuru luru di, mu kwa umu, nāchi kwa èzí-na-ulo-ha, ghara kwa inye onye nēmegide ayi ihe o gēji kwutọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị.