1 Timothy 5:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla.
Igbo 2006
Ọ buru na nwanyi ọ bula nke kwere ekwe nwere ndinyom di-ha nwuru, ya b͕o ha nkpà, ka aghara kwa ibob͕u nzukọ Kraist; ka o we b͕o ndi ahu nkpà, bú ndi nọ n'ezie n'ọnọdu ndinyom di-ha nwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nwanyị ọbụla kwere ekwe, nke nwere nʼezinaụlọ ya ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, ya jisie ike gboro ha mkpa. Ọ dịghị mma ibogbu chọọchị nʼibu, ka o nwee ike iletazu ndị nọ nʼọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nʼezie.