1 Timothy 5:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke.
Igbo 2006
Ka agua ndi-okenye na ndi kwesiri nsọpuru okpukpu abua, bú ndi nāchi isi nke-ọma, ma nke kachasinu ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nime okwu Chineke na ozizí.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe.