1 Timothy 5:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ejila ihe kechie ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọka, kama hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ!” Akwụkwọ nsọ kwukwara nꞌebe ọzọ sị, “Onye na-arụ ọrụ kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya”.
Igbo 2006
N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka. Na, Onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka,” hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, “Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya.”