1 Timothy 5:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.
Igbo 2006
Ma ọ buru na nwanyi ọ bula di-ya nwuru nwere umu ma-ọbu umu umu, ka ha buru uzọ muta isọpuru Chineke n'aru ndi èzí-na-ulo nke aka ha, na inyeghachi ndi muru ha ihe: n'ihi na nka bu ihe anānara nke-ọma n'iru Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.