1 Timothy 5:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile.
Igbo 2006
Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di.