1 Timothy 6:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a.
Igbo 2006
Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị.