1 Timothy 6:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama.
Igbo 2006
Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.