1 Timothy 6:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ana m enye gị iwu nꞌihu Chineke, onye na-enye mmadụ nile ndụ, na nꞌihu Kraịst Jisọs onye gbasiri ama ike nꞌihu Pailet na-atụghị ụjọ.
Igbo 2006
Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu