1 Timothy 6:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka i debezuo ihe nile Chineke nyere gị nꞌiwu idebe. Ka onye ọ bụla ghara ịchọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌime gị, site ugbu a ruo mgbe Kraịst ga-abịaghachi ọzọ.
Igbo 2006
ka gi onwe-gi debe ihe ahu enyere n'iwu, nēnweghi ntupọ, onye anādighi-akalu akalu, rue ngosi nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe.