1 Timothy 6:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe.
Igbo 2006
nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.