1 Timothy 6:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin.
Igbo 2006
Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.