1 Timothy 6:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile.
Igbo 2006
Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.