1 Timothy 6:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha.
Igbo 2006
ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere.