1 Timothy 6:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a.
Igbo 2006
Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n'ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n'ihi na ndi soro ha ke òkè n'ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n'anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya. Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a.