1 Timothy 6:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Biko, Timoti, ahapụkwala imezu ihe ndị a Chineke tinyere gị nꞌaka ime. Wezuga onwe gị nꞌirụ ụka nzuzu nile nke ndị ahụ na-anya isi banyere amamihe ha nwere, na-achọ ka i soro ha rụọ ụka. Ndị a na-esite nꞌinya isi ha gosi nꞌezie na ha amaghị ihe ọ bụla.
Igbo 2006
Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma,