1 Timothy 6:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ.
Igbo 2006
Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.