2 Chronicles 1:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Chineke we si Solomon, N'ihi na nka di n'obi-gi, ma i riọghi àkù, ma-ọbu ihe-nkpakọta, ma-ọbu nsọpuru, ma-ọbu ndu ndi nākpọ gi asì, i riọghi kwa ọtutu ubọchi; kama i riọworo onwe-gi amam-ihe na ihe-ọmuma, ka i we kpe ndim ikpe, bú ndi M'meworo gi eze-ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.