2 Chronicles 1:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n'aka-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.