2 Chronicles 1:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Solomon we rigo n'ebe ahu rue ebe-ichu-àjà ọla n'iru Jehova, nke di n'ulo-ikwū nzute, o we sure nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri n'elu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.