2 Chronicles 13:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.