2 Chronicles 14:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Asa kpọkuru Onyenwe anyị Chineke ya, si, “ Onyenwe anyị ọ dịghị onye dịka gị nʼinyere onye na-adịghị ike aka nʼihu onye dị ike nke ukwuu. Nyere anyị aka, O Onyenwe anyị Chineke anyị, nʼihi na anyị dabere na gị. Ọ bụkwa nʼaha gị ka anyị na-apụ ibuso igwe a agha. O Onyenwe anyị i bụ Chineke anyị. Ekwela ka ọ bụrụ na mmadụ efu meriri gị.”