2 Chronicles 15:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.