2 Chronicles 16:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.