2 Chronicles 18:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mb͕e arọ ufọdu gwusiri ọ ridakuru Ehab, rue Sameria. Ehab we b͕uere ya aturu na ehi n'uba, b͕u-kwa-ra ndi ya na ha yikọrọ, o we kpalie ya irigoru Remot-gilead.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha.