2 Chronicles 19:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma, le, Amaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke Jehova; Zebadaia nwa Ishmael, bú onye-ndú ulo Juda, bu onye-isi-unu n'okwu ọ bula nke eze: ndi Livai gābu kwa ndi-odozi-okwu n'iru unu. Dinu ike, me; ka Jehova nọye-kwa-ra ezi madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”