2 Chronicles 19:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n'etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.