2 Chronicles 2:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.