2 Chronicles 20:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.