2 Chronicles 20:34 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.