2 Chronicles 21:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Odide-akwukwọ we si n'aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N'ihi na i jeghi ije n'uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n'uzọ nile nke Esa, bú eze Juda;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,