2 Chronicles 21:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ha we rigo imegide Juda, we tipúe ya, dọta àkù nile ahuru n'ulo eze, na umu-ya ndikom kwa, na ndinyom-ya, n'agha; ọ dighi kwa nwa-nwoke fọduru ya, ọ bu nání Jehoahaz, bú nke-ntà nime umu-ya ndikom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.