2 Chronicles 21:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.