2 Chronicles 22:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n'ọnọdu ya: n'ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n'ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị.