2 Chronicles 22:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.