2 Chronicles 23:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.