2 Chronicles 24:11 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n'ulo-nlekọta eze site n'aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n'ib͕e, būru ya, bughachi ya n'ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n'uba.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu.