2 Chronicles 24:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.