2 Chronicles 26:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n'ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.