2 Chronicles 26:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.